26Nʼoge ahụ, olu ya mere ka ụwa ma jijiji, ma ugbu a, ọ kwela nkwa, sị, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ, ọ bụghị naanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.”
27Okwu a bụ, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ,” na-egosi mwepụ nke ihe na-ama jijiji dịka ihe e kere eke, iji hụ na nke na-anaghị ama jijiji ga-adị.
28Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata.
29Nʼihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erepịa erepịa.