8Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
9Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya.
10Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya.
11Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu.
12Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ.