12Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ.
13Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri.
14Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa.
15Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.
16Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.