9Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile.
10Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ.
11Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya.
12Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.”
13Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.”