Ndị Hibru 3

unu emela ka obi unu sie ike, dị ka unu mere nʼoge nnupu isi mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara,

Hebrews 3:8 (UKJV) Harden not your hearts, as in the provocation, in the day of temptation in the wilderness:

6Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.

7Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa,

8unu emela ka obi unu sie ike, dị ka unu mere nʼoge nnupu isi mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara,

9ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa. Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a.

10Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ. Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile. Ha amatabeghị ụzọ m niile.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.