2Ebe ọ bụ na ya onwe ya bụ onye na-adịghị ike, ọ pụrụ iji nwayọọ na-emeso ndị na-amaghị ihe na ndị na-ejehie ụzọ omume.
3Nʼihi nke a, ọ ghaghị ịchụ aja maka mmehie nke onwe ya na nke ndị mmadụ.
4O nweghị onye na-ewere ugwu a nʼonwe ya, kama ọ bụ Chineke na-akpọ dịka o si kpọọ Erọn.
5Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị.”
6Nʼebe ọzọ, o kwuru, “Dị ka usoro Melkizedek si dị, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.”