Ndị Hibru 6

ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa,

Hebrews 6:5 (UKJV) And have tasted the good word of God, and the powers of the world to come,

3Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe.

4Ma ọ dịghị mfe ịkpọghachi ndị dara ada ọzọ, bụ ndị natarala ihe ahụ na mbụ, ndị detụkwara onyinye amara dị iche iche nke si nʼeluigwe bịa ire, ndị ketakwara oke Mmụọ Nsọ,

5ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa,

6ma mesịa dahie nʼonwe ha, ọ bụ ihe siri ike ịkpọghachite ha ruo nchegharị. Ha na akpọgidekwa Ọkpara Chineke nʼobe ọzọ, na emenyekwa ya ihere nʼihu ọha mmadụ.

7Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.