10Nʼihi na mgbe Melkizedek zutere ya, ọ ka nọ nʼafọ nna nna ya.
11Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn?
12Ebe a gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nʼotu aka ahụ, a ghaghị ịgbanwekwa iwu.
13Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja.
14Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja.