15E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara.
16Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi.
17Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.”
18Nʼotu aka ahụ, e wezugala usoro iwu ochie ahụ nʼihi adịghị ike ya na nʼihi abaghị uru ya
19(nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso.