19(nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso.
20Ma e ji ịṅụ iyi mee ka ọnọdụ onyeisi nchụaja a guzosie ike. O nweghị iyi a ṅụrụ mgbe ndị ọzọ ghọrọ ndị nchụaja.
21Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
22Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma.
23Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha.