Ndị Hibru 7

Mmadụ pụrụ isi na Livayị onye natara otu ụzọ nʼụzọ iri kwụrụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ya site nʼaka Ebraham.

Hebrews 7:9 (UKJV) And as I may so say, Levi also, who receives tithes, paid tithes in Abraham.

7O nweghị ịrụrịta ụka ọbụla dị ya, na onye dị ukwuu na-agọzi onye dị nta.

8Nʼotu aka ahụ, ndị na-anata otu ụzọ nʼụzọ iri bụ mmadụ na-anwụ anwụ, ma nʼaka nke ọzọ, onye na-anata ya bụ onye ahụ e kwupụtara na ọ na-adị ndụ.

9Mmadụ pụrụ isi na Livayị onye natara otu ụzọ nʼụzọ iri kwụrụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ya site nʼaka Ebraham.

10Nʼihi na mgbe Melkizedek zutere ya, ọ ka nọ nʼafọ nna nna ya.

11Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.