Ndị Hibru 9

Na-ekwu, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke nyere unu iwu.”

Hebrews 9:20 (UKJV) Saying, This is the blood of the testament which God has commanded with authority unto you.

18Ọ bụ nke a mere ọ bụladị ọgbụgba ndụ ochie ahụ jiri bụrụ ihe na-adịghị ire ruokwa mgbe ọbara batara na ya.

19Mgbe Mosis kwupụtachara ndị mmadụ iwu ahụ, o weere ọbara ụmụ ehi na ewu, ya na mmiri, ogbo uhie na hisọp fesaa nʼakwụkwọ iwu ahụ nakwa nʼelu mmadụ niile.

20Na-ekwu, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke nyere unu iwu.”

21Nʼotu aka ahụ, o fesakwara ọbara ahụ nʼelu ụlọ ikwu na nʼelu ihe niile dị nʼụlọ ikwu, bụ ihe niile e ji efe ofufe.

22Nʼikwu eziokwu, dịka iwu si dị, ọ dịghị ihe ọbụla nke a na-adịghị eji ọbara edo ọcha. Ọ bụrụ na a wụsịghị ọbara, mgbaghara mmehie adịghị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.