8Mgbe ọ jụrụ Lo-Ruhama ara, ọ tụụrụ ime ọzọ, mụọ nwa nwoke.
9Onyenwe anyị sịrị, “Kpọọ aha ya Lo-ammi, nke pụtara unu abụghị ndị m, nʼihi na unu abụghị ndị nke m, mụ onwe m abụkwaghị Chineke unu.
10“Ma ọnụọgụgụ ụmụ Izrel ga-adị ka aja dị nʼọnụ oke osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ tụọ nʼihe ọtụtụ. Nʼebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ nʼebe ahụ ka a ga-anọ sịkwa ha, ‘Ụmụ Chineke dị ndụ ka unu bụ.’
11A ga-achịkọtakwa ndị Juda na ndị Izrel ọnụ. Ha ga-ahọpụtakwara onwe ha otu onyeisi, si nʼala ahụ rigopụta, nʼihi ihe ukwu ka ụbọchị Jezril ga-abụ.