9“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie, i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị. Ọ bụ na agha agaghị eri ha bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?
10Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ; mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha, taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha.
11Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya, nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu nʼolu ọma ya ahụ. Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya, Juda aghaghị ịkọ ala ubi Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya.
12Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu, unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya. Kọgharịakwanụ obi unu siri ike, nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ bịara wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume.
13Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume; unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi. Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha. Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu, na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu.