Hosiya 10

A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile,

Hosea 10:7 (UKJV) As for Samaria, her king is cut off as the foam upon the water.

5Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven. Ndị ya ga-eruru ya ụjụ, otu a kwa ka ndị nchụaja ya rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ, maka ebube nke a napụrụ ya.

6Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa, dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ. A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu, Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ.

7A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile,

8a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven, ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel, ogwu na uke ga-etolitekwa, nʼebe nchụaja ha. Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!” Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!”

9“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie, i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị. Ọ bụ na agha agaghị eri ha bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.