Hosiya 11

Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m. Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu, ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla.

Hosea 11:7 (UKJV) And my people are bent to backsliding from me: though they called them to the most High, none at all would exalt him.

5“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt, Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha, nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m?

6Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile, ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa, ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile.

7Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m. Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu, ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla.

8“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem? M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel? M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma? M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim? Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m; ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka.

9Agaghị m emezu iwe ọkụ m maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ. Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ. Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu. Agaghị m emegidekwa obodo ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.