Hosiya 13

Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel. Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara.

Hosea 13:1 (UKJV) When Ephraim spoke trembling, he exalted himself in Israel; but when he offended in Baal, he died.

1Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel. Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara.

2Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie, ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche, nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma, ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka. Ha onwe ha na-ekwu, “Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ. Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ”

3Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ, maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa, dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka, dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.