12Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.
13Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya; maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche. Mgbe oge ya zuru, ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya.
14“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla,
15ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile. Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere, ga-esi nʼọzara fekwasị ya. Isi iyi niile ga-ata, olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa. A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile, na akụ niile o nwere.
16Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya, nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha. A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile, tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala, jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”