Hosiya 4

Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.

Hosea 4:1 (UKJV) Hear the word of the LORD, all of you children of Israel: for the LORD has a controversy with the inhabitants of the land, because there is no truth, nor mercy, nor knowledge of God in the land.

1Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.

2Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.

3Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ, ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.