Hosiya 4

Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.

Hosea 4:2 (UKJV) By swearing, and lying, and killing, and stealing, and committing adultery, they break out, and blood touches blood.

1Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.

2Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.

3Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ, ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.

4“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.