9Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa. Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.
10“Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, were onwe ha nyefee
11nʼaka ịgba akwụna, na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, nke na-ewepụ mmụọ nghọta.
12Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme, na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase. Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo; ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.
13Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.