Hosiya 5

Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ, aga m ata ha niile ahụhụ.

Hosea 5:2 (UKJV) And the apostates are profound to make slaughter, though I have been a rebuker of them all.

1“Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja! Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel! Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze. Nʼihi na ọ bụ unu ka ikpe ahụ gbasara. Nʼihi na unu abụrụla ihe ị maa nʼọnya na Mizpa, na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa.

2Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ, aga m ata ha niile ahụhụ.

3Amaara m ihe niile gbasara Ifrem, ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ. Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna; gị Izrel, emerụọkwala gị.

4“Omume ha agaghị ekwe ka ha laghachikwute Chineke ha, nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha, ha amaghịkwa Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.