1mgbe m chọrọ ịgwọ Izrel, mmehie Ifrem na-apụta ihe, a na-ekpughekwa arụ a na-eme na Sameria. Ha na-aghọ aghụghọ, ndị ohi na-akụwakwa ụlọ ndị mmadụ, ndị na-apụnara mmadụ ihe nọ nʼokporoụzọ.
2Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara na m na-echeta mmehie ha niile. Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu. Ana m ahụkwa ha niile.
3“Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha; ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha.