10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya.
11“Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa.
12Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
13Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ha ajụla m. Ha na-ala nʼiyi nʼihi na ha enupula isi ha megide m. Achọrọ m ka m gbapụta ha, ma ha na-agha ụgha megide m.
14Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.