4Ha niile bụ ndị na-akwa iko; ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ, nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ, site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.
5Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị, ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke, ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka.
6Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha, ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya. Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ, nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ.
7Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ. Ha na-eripịa ndị eze ha. Ndị eze ha niile na-ada, ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m.
8“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ. Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.