7Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ. Ha na-eripịa ndị eze ha. Ndị eze ha niile na-ada, ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m.
8“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ. Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.
9Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha, ma ha adịghị aghọta ya. Isi awọ apụtala ha nʼisi, ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị.
10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya.
11“Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa.