1“Tinye opi ike nʼọnụ gị! Nʼihi na ugo nʼefefe nʼelu ụlọ Onyenwe anyị, nʼihi na ha emebiela ọgbụgba ndụ m, nupu isi megide iwu m.
2Ugbu a ndị Izrel na-etiku m mkpu akwa, ‘Chineke anyị, anyị bụ Izrel maara gị.’
3Ma Izrel ajụla ihe dị mma. Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ.
4Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase; ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị, ma ghara ịjụta ase nʼaka m. Ọlaọcha na ọlaedo ha ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị, nke ha ji ebibi onwe ha.