9Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu, dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea. Ọ ga-echeta njehie ha. Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile.
10“Mgbe m chọtara Izrel, ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara; mgbe m hụrụ nna nna unu ha, ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig. Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa, ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere, si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ.
11Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ, nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime.
12A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha, aghaghị m ime ka ha nwụọ. Ahụhụ ga-adịrị ha, mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m.
13Ahụla m na Ifrem yiri Taịa, bụ ihe akụnyere nʼala mara mma. Ma Ifrem ga-eji aka ya kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.”