14Biko, Onyenwe anyị nye ha. Gịnị ka i kwesiri inye ha? Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya, na ara nke mmiri ara na-adịghị.
15“Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal, akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ. Nʼihi omume mmehie ha niile, aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha. Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ, ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi.
16Etigbuola Ifrem, mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla, ha agaghị amịkwa mkpụrụ. A sịkwarị na ha amụọ ụmụ, aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.”
17Chineke m ga-ajụ ha, nʼihi na ha adịghị ege ya ntị maọbụ rube isi. Ha ga-aghọ ndị na-awagharị awagharị na-enweghị ụlọ, nʼetiti mba niile.