4Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị, nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ. Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị. Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha, ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
5Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka, ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị?
6A sịkwa na ha agbanarị mbibi, ndị Ijipt ga-achịkọta ha. Ndị Memfis ga-elikwa ha. Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ, ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile,
7Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ na-abịa, Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso. Ka Izrel mara nke a. Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu, nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala, unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu, na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara.
8Ma onye amụma bụ onye nche Chineke, na-eche Ifrem nche, ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile, ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya.