11“Nʼihi gịnị ka unu ji na-achụrụ m ọtụtụ aja, gịnị ka ihe ndị a bụ nye m?” ka Onyenwe anyị sịrị. “Afọ ejula m nʼaja nsure ọkụ niile nke eji ebule na anụmanụ e mere ka ha gbaa abụba chụọ; Ọbara oke ehi na nke ụmụ atụrụ na mkpi adịghị atọkwa m ụtọ.
12Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m, onye chọrọ nke a nʼaka unu? Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m.
13Kwụsị iweta onyinye niile na-enweghị isi. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ unu bụrụ m ihe arụ. Mmemme ọnwa ọhụrụ, na nke ụbọchị izuike, na nzukọta unu niile, apụghị m ịnagide mkpọkọta unu nke na-abaghị uru.
14Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ a kara aka asị. Ha bụụrụ m ibu arọ, ike agwụkwala m ibu ha.
15Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara!