Aịzaya 1

Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a.

Isaiah 1:19 (UKJV) If all of you be willing and obedient, all of you shall eat the good of the land:

17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.

18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha.

19Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a.

20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.

21Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi aghọọla onye akwụna! Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi; ezi omume na-anọbu nʼime ya, ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.