16Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma.
17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.
18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha.
19Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a.
20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.