14Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ a kara aka asị. Ha bụụrụ m ibu arọ, ike agwụkwala m ibu ha.
15Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara!
16Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma.
17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.
18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha.