24Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị, “Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m, ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ.
25Aka m ga-abịakwasị unu. Aga m anụcha unu dịka e si anụcha ọlaedo, si otu a wepụchaa unyi niile dị nʼime unu.
26Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ. Ọzọ, a ga-akpọ obodo unu Obodo Ezi Omume, Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.”
27A ga-eji ikpe ziri ezi zọpụta Zayọn. Ọ ga-ejikwa ezi omume zọpụta ndị niile lọghachikwutere ya.
28Ma ndị mmehie niile na ndị niile na-enupu isi ka ọ ga-ala nʼiyi; ọ ga-egbukwa ndị niile na-agbakụta Onyenwe anyị azụ.