26Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ. Ọzọ, a ga-akpọ obodo unu Obodo Ezi Omume, Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.”
27A ga-eji ikpe ziri ezi zọpụta Zayọn. Ọ ga-ejikwa ezi omume zọpụta ndị niile lọghachikwutere ya.
28Ma ndị mmehie niile na ndị niile na-enupu isi ka ọ ga-ala nʼiyi; ọ ga-egbukwa ndị niile na-agbakụta Onyenwe anyị azụ.
29“Ihere ga-eme unu nʼihi osisi ook nsọ ndị ahụ niile obi unu na-enwe aṅụrị nʼime ha. Ihere ga-eme unu nʼihi ubi a gbara ogige ndị ahụ unu jiri aka unu họrọ.
30Unu ga-ala nʼiyi dịka osisi ook na-akpọnwụ akpọnwụ maọbụ ka ubi a gbara ogige nke mmiri kọrọ.