Aịzaya 1

“Ihere ga-eme unu nʼihi osisi ook nsọ ndị ahụ niile obi unu na-enwe aṅụrị nʼime ha. Ihere ga-eme unu nʼihi ubi a gbara ogige ndị ahụ unu jiri aka unu họrọ.

Isaiah 1:29 (UKJV) For they shall be ashamed of the oaks which all of you have desired, and all of you shall be confounded for the gardens that all of you have chosen.

27A ga-eji ikpe ziri ezi zọpụta Zayọn. Ọ ga-ejikwa ezi omume zọpụta ndị niile lọghachikwutere ya.

28Ma ndị mmehie niile na ndị niile na-enupu isi ka ọ ga-ala nʼiyi; ọ ga-egbukwa ndị niile na-agbakụta Onyenwe anyị azụ.

29“Ihere ga-eme unu nʼihi osisi ook nsọ ndị ahụ niile obi unu na-enwe aṅụrị nʼime ha. Ihere ga-eme unu nʼihi ubi a gbara ogige ndị ahụ unu jiri aka unu họrọ.

30Unu ga-ala nʼiyi dịka osisi ook na-akpọnwụ akpọnwụ maọbụ ka ubi a gbara ogige nke mmiri kọrọ.

31Onye kachasị ike nʼetiti unu ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa na-ere ọkụ; ọrụ ya ga-abụ icheku ọkụ nke ga-emenye ọkụ ahụ ga-erepịa unu. Ọ dịkwaghị onye pụrụ imenyụ ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.