21Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu.
22Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi. A kabiela ịla nʼiyi, nke dị oke ukwuu ya na ezi omume.
23E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela na ọ ga-ebibi ala ahụ niile.
24Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị, “Unu ndị m, ndị bi na Zayọn, unu atụkwala ndị Asịrịa egwu bụ ndị na-eti unu mkpara igwe, na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere.
25Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ, ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.”