10Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu agaghị egosipụta ìhè ha. Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
11Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya, taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa, ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.
12Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha, ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa.
13Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji, meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya, nʼihi oke iwe ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.
14Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ. Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta, maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha.