5Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa. Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị na-abịa imebi ala ahụ niile.
6Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.
7Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba, obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.
8Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu. Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme. Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme. Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.
9Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma. A ga-ekpochapụ ala ahụ, ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya.