8Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị, “Agbajiela ike gị; ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.”
9Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche.
10Ha niile ga-eji otu olu zaa, ha ga-asị gị, “Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike; Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.”
11Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị.
12Lee ka i si site nʼeluigwe daa, gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ. Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ, ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala.