Aịzaya 18

Unu niile bi nʼelu ụwa dum, na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị. Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile, lee anya; mgbe a fụrụ opi ike, gee ntị.

Isaiah 18:3 (UKJV) All you inhabitants of the world, and dwellers on the earth, see all of you, when he lifts up an explicit sign on the mountains; and when he blows a trumpet, hear all of you.

1Ahụhụ ga-adịrị ala ahụ a na-anụ ụzụ ọtụtụ nku nʼime ya, ala ahụ dị nʼofe iyi ukwu niile nke Kush.

2Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri, bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri. Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọ gakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ, gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile, mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa, ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.

3Unu niile bi nʼelu ụwa dum, na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị. Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile, lee anya; mgbe a fụrụ opi ike, gee ntị.

4Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m, “Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m, dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi, na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.”

5Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị, mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata, ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya, ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.