Aịzaya 18

A ga-ahapụ ozu ndị agha ha ka anụ ufe nke ugwu na ụmụ anụ ọhịa rie ha. Ụmụ nnụnụ ga-eri anụ ha nʼoge okpomọkụ, ma ụmụ anụ ọhịa ga-eri ha nʼoge oyi.

Isaiah 18:6 (UKJV) They shall be left together unto the fowls of the mountains, and to the beasts of the earth: and the fowls shall summer upon them, and all the beasts of the earth shall winter upon them.

4Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m, “Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m, dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi, na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.”

5Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị, mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata, ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya, ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.

6A ga-ahapụ ozu ndị agha ha ka anụ ufe nke ugwu na ụmụ anụ ọhịa rie ha. Ụmụ nnụnụ ga-eri anụ ha nʼoge okpomọkụ, ma ụmụ anụ ọhịa ga-eri ha nʼoge oyi.

7Ma mgbe ahụ, a ga-ewetara Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye dị iche iche, site na ndị toro ogologo, ndị ahụ na-akwọ mụrụmụrụ, site na ndị a na-atụ egwu nʼebe niile, bụ mba ndị okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa, ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha. A ga-eweta onyinye a nʼUgwu Zayọn, nʼebe ahụ a na-akpọku aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.