14Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke; nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ.
15Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime, isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.
16Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha.
17Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.
18Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.