Aịzaya 19

Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.

Isaiah 19:17 (UKJV) And the land of Judah shall be a terror unto Egypt, every one that makes mention thereof shall be afraid in himself, because of the counsel of the LORD of hosts, which he has determined against it.

15Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime, isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.

16Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha.

17Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.

18Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.

19Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.