17“Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka, tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke.
18Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ, tufuo gị nʼobodo sara mbara. Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ, nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị.
19Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị, na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala.
20“Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya.
21Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem na ndị Juda nna.