Aịzaya 22

Ndịisi unu niile agbapụchaala. E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ. Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya.

Isaiah 22:3 (UKJV) All your rulers are fled together, they are bound by the archers: all that are found in you are bound together, which have fled from far.

1Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ. Ọ bụkwa gịnị na-eme unu ugbu a nke mere na unu niile rịgooro nʼelu ụlọ?

2Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara, gị obodo oke ụzụ na-aṅụrị obi ụtọ? Ndị unu niile nwụrụ anwụghị nʼime ọgbọ agha, ma ọ bụkwanụ site na mma agha.

3Ndịisi unu niile agbapụchaala. E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ. Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya.

4Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m; ka m bee akwa dị ilu. Unu anwakwala ịkasị m obi, nʼihi mbibi e bibiri ndị m.”

5Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị, nʼime ndagwurugwu nke ọhụ, ọ bụ ụbọchị itida mgbidi na nke itiku ugwu niile mkpu akwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.