10Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl, unu ụmụada Tashish, nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri.
11Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri mee ka alaeze ha niile maa jijiji. O nyela iwu banyere Fonisia ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike.
12Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ, gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu. “Bilie, gafee garuo Saiprọs, ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.”
13Lee anya nʼala ndị Kaldịa, ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ! Ndị Asịrịa mere ya ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara. Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike, mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe.
14Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri, nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.