Aịzaya 24

Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto. Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu.

Isaiah 24:15 (UKJV) Wherefore glorify all of you the LORD in the fires, even the name of the LORD God of Israel in the isles of the sea.

13Otu a ka ọ ga-adị nʼụwa niile, nakwa nʼetiti mba niile, dịka mgbe a na-etitusi mkpụrụ dị nʼelu osisi oliv, maọbụ mgbe ahapụrụ ụfọdụ mkpụrụ grepu nʼelu osisi mgbe a ghọchasịrị ihe ubi.

14Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ; ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke Onyenwe anyị.

15Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto. Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu.

16Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa. Ha ga-abụ abụ na-asị, “Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ.” Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. “Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ! Ahụhụ dịrị m! Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị. Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị.”

17Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu, unu ndị niile bi nʼụwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.