15Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto. Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu.
16Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa. Ha ga-abụ abụ na-asị, “Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ.” Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. “Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ! Ahụhụ dịrị m! Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị. Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị.”
17Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu, unu ndị niile bi nʼụwa.
18Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu ga-adaba nʼolulu; onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụta ga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya. Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu. Ntọala ụwa na-amakwa jijiji.
19Ụwa adapịasịala; ụwa agbawasịala; e jirila oke ike nugharịa ụwa.